Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

Zekaraya 7

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu nke Onyenwe anyị ruru Zekaraya ntị nʼụbọchị nke anọ, nʼọnwa nke itoolu, nke bụ ọnwa Kislev.
2Nʼoge a, ndị bi nʼobodo Betel ezitela Shareza, na Regem Melek, ha na ndị ọzọ ka ha bịa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ,
3ka ọ jụkwaa ndị nchụaja nọ nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndị amụma, sị, “Ọ bụ m ruo ụjụ, bukwaa ọnụ nʼọnwa nke ise, dịka m si eme kemgbe ọtụtụ afọ ndị a gara aga?”
4Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị,
5“Gwanụ ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a, ‘Mgbe unu na-ebu ọnụ nʼọnwa nke ise ọbụla, na nʼọnwa nke asaa ọbụla, iri afọ asaa ndị a niile gara aga, ọ bụ mụ ka unu na-eburu ọnụ?
6Mgbe unu na-eri na-aṅụkwa, ọ bụ na unu anaghị eme ya maka nʼihi onwe unu?
7Ihe ndị a ha ọ bụghị okwu niile Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma mbụ, mgbe Jerusalem na obodo niile dị ya gburugburu nọ nʼudo nwekwa ọganihu, nʼoge ndị mmadụ bi na Negev, ya na ala ndịda ugwu niile?’ ”
8Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru Zekaraya ntị na-asị,
9“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi, meerenụ ibe unu ebere, ma gosikwa ibe unu ọmịiko.
10Unu emegbula ụmụ nwanyị di ha nwụrụ maọbụ nwa na-enweghị nne na nna maọbụ ndị ọbịa maọbụ ndị ogbenye. Unu echela echiche ọjọọ nʼobi unu megide ibe unu.’
11“Ma ha jụrụ ige ntị; ha sitere nʼobiike ha gbakụta m azụ ha, were mkpịsịaka rụchie ntị ha, ka ha ghara ige m ntị.
12Ha mere ka obi ha sie ike dịka nkume, jụ ige ntị nʼiwu, na nʼokwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sitere na Mmụọ ya zie ndị amụma mbụ ahụ. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile were oke iwe.
13“ ‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
14‘Eji m oke ifufe gbasasịa ha nʼetiti mba niile, ndị ha na-amaghị. Emere m ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụ inwe ike ịpụ maọbụ ịbata nʼime ya. Otu a ka ha si mee ka ala ọma ahụ ghọọ ala tọgbọrọ nʼefu.’ ”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.