Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

Zekaraya 12

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị banyere Izrel. Ọ bụ amụma. Onyenwe anyị, onye gbasapụrụ eluigwe niile, onye tọrọ ntọala ụwa, na onye kpụrụ mmụọ nke dị nʼime mmadụ, ekwupụtala, sị,
2“Agaje m ime Jerusalem ka ọ bụrụ iko mmanya nke ga-aṅagharị ndị niile gbara ya gburugburu. Ha ga-agba Juda na Jerusalem gburugburu, nọbichie ụzọ ya niile.
3Nʼụbọchị ahụ, mgbe mba niile nke ụwa chịkọtara onwe ha ọnụ imegide ya, aga m eme Jerusalem ka ọ ghọọrọ mba ndị ahụ niile nkume dị ukwuu nke a na-apụghị inugharị enugharị. Ndị niile ga-agbalị inugharị ya ga-emerụ onwe ha ahụ.
4Nʼụbọchị ahụ, aga m etinye ụjọ nʼobi ịnyịnya niile, mee ka ndị na-agba ha ghọọ ndị ara,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m asaghe anya m lekwasị ụlọ Juda nke ọma, ma aga m eme ka ịnyịnya niile nke mba niile kpuo ìsì.
5Mgbe ahụ, ndị ndu Juda ga-ekwu nʼobi ha sị, ‘Ndị Jerusalem achọtala ike nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha.’
6“Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka ndị ndu Juda niile dịrị ka ite ọkụ, nke a dọnyere nʼebe a chịkọtara nkụ. Ha ga-adịkwa ka ọkụ na-enwu enwu, nke dị nʼetiti ukwu ọka. Ha ga-ere ọkụ nʼaka nri na nʼaka ekpe, rechapụ ndị niile bi gburugburu ha. Ma mmadụ ga-ejupụtakwa nʼime Jerusalem.
7“Onyenwe anyị ga-ebu ụzọ zọpụta ebe obibi niile nke Juda, ime ka ugwu na nsọpụrụ nke ụlọ Devid, na nke ndị niile bi na Jerusalem ghara ịdị ukwuu karịa nke Juda.
8Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-echebe ndị bi na Jerusalem, mee ka ọ bụladị ndị na-asọ ngọngọ nʼetiti ha dịrị ike dịka Devid. Ụlọ Devid ga-adịkwa ka Chineke, dịka Mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye na-eje nʼihu ha.
9Nʼụbọchị ahụ, aga m ebido ibibi mba ndị ahụ niile na-ebuso Jerusalem agha.
10“Mgbe ahụ, aga m awụkwasị nʼụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem, mmụọ nke amara na nke arịrịọ amara. Ha ga-elegidekwa m anya, bụ onye ahụ ha mapuru ahụ. Ha ga-eru ụjụ nʼihi ya, dịka mmadụ si eru ụjụ nʼihi ọnwụ nke nwa a mụrụ naanị ya. Ha ga-ebekwa akwa ilu nke ukwuu dịka mmadụ sị ebe akwa maka nwa mbụ ya.
11Nʼụbọchị ahụ, akwa a ga-akwa na Jerusalem ga-adị ukwuu, dịka akwa nke Hadad Rimọn nʼobosara ala Megido.
12Ndị ala ahụ niile ga-eru ụjụ. Ikwu ọbụla ga-eru ụjụ nke ha, ha na ndị nwunye ha. Ikwu Devid na ndị nwunye ha, na ikwu Netan na ndị nwunye ha,
13na ikwu Livayị, na ndị nwunye ha, na ikwu Shimei na ndị nwunye ha,
14na ikwu ndị ọzọ niile na ndị nwunye ha.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.