Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

Abụ Ọma 92

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị, na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,
2ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ, na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị,
3jiri ihe iti egwu ụbọ akwara na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.
4Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị, Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ.
5Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị. Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche.
6Ndị uche kọrọ amaghị nke a, ndị nzuzu enweghị nghọta,
7ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa, a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
8Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
9Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị, e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi; ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị.
10I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike; awụsala m mmanụ dị mma.
11Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m; ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri.
12Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn,
13nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị, ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị.
14Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ,
15na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi; ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.