Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

Abụ Ọma 75

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1Anyị na-eto gị, O Chineke. Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso. Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.
2Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka. Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.
3Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, ọ bụ m na-ejidesi ogidi ya ike ka o guzo chịm. Sela
4Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ, nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi unu elu.
5Unu ewelila mpi unu megide eluigwe; unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ”
6Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ, maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.
7Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe; ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.
8Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche. Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.
9Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi. Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,
10bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile, ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.