Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

Abụ Ọma 66

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
2Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!
3Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.
4Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela
5Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!
6O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.
7Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela
8Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya;
9O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.
10Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị; ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.
11Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ, ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.
12I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.
13Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị, imezu nkwa m kwere gị
14nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo, ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.
15Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja, ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule; Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. Sela
16Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; ka m kọọrọ unu ihe o meere m.
17Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire.
18Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;
19ma Chineke gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m.
20Otuto dịrị Chineke, onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.