Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

Abụ Ọma 24

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
2Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike.
3Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
4Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.
5Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
6Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela
7Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata.
8Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.
9Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.
10Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! Sela
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.