Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

Abụ Ọma 137

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa mgbe anyị chetara Zayọn.
2Ọ bụ nʼosisi pọpla ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.
3Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ, ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ; ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị ebe anyị nọ nʼala ọzọ?
5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem, ka aka nri m chefuo ǹka ya.
6Ọ bụrụ na m echezọọ gị, ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche banyere Jerusalem, oke ọṅụ m, ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
7Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha. “Tikpọsịa ya,” ka ha tiri, “Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”
8Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi, ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị nʼihi ihe i mere anyị,
9onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara tụpịa ha nʼelu nkume.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.