Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

Izikiel 19

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1“Ma gị onwe gị, bụọrọnụ ndịisi Izrel abụ akwa a,
2ma kwuo, “ ‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụ nʼetiti ụmụ ọdụm. Ọ dinara nʼetiti ha, na-azụ ụmụ ya.
3Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike. Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa, ghọọ ọdụm na-eri mmadụ.
4Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya, mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru. Ha ji nko koro ya, duru ya gaa nʼala Ijipt.
5“ ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ, matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu, ọ họpụtara nwa ya ọzọ kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike.
6Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile, nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike, ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa, ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ.
7O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe. Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya, mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.
8Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche iche pụtara gbaa ya gburugburu. Ha sitere nʼakụkụ niile nwude ya nʼọnya olulu ha siiri ya.
9Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa, bute ya nʼihu eze Babilọn. E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu, ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọ nʼugwu niile nke Izrel.
10“ ‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnị a kụrụ nʼakụkụ mmiri, nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụ nʼihi mmiri ọ na-enweta.
11Alaka ya niile siri ike, ha topụtara ghọọ mkpara eze. O topụrụ etopụ, tokarịa alaka ndị ọzọ elu. Nke a mere e ji na-ahụ ya anya site nʼebe dị anya.
12Ma e ji oke iwe hopu ya tụpụ ya nʼala. Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa, meekwa ka mkpụrụ ya daa. Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị, ọkụ rechapụkwara ha niile.
13Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzara ebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị.
14Ọkụ esitela nʼogwe ya rechapụ alaka ya na mkpụrụ ya niile. Ọ dịkwaghị alaka siri ike fọdụrụ nke dịkwa mma ịbụ mkpara eze.’ Abụ a bụ abụ akwa, nke e kwesiri ịbụ mgbe ịkwa akwa.”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.