Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

Ekiliziastis 9

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1Ihe ndị a niile ka m tulere nke ọma nʼobi m, kpebie na ihe ndị ezi omume na ndị maara ihe na-eme dị nʼaka Chineke, ma ọ dịghị onye maara ihe na-echere ha maọbụ ịhụnanya maọbụ ịkpọ asị.
2Ihe niile na-adakwasị mmadụ niile nʼotu ụzọ ahụ, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, ezi mmadụ na onye na-abụghị ezi mmadụ, onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ aja na onye na-adịghị achụ aja. Dịka ọ dịrị ezi mmadụ, otu a ka ọ dịrị onye mmehie; dịka ọ dịrị ndị na-aṅụ iyi, otu a kwa ka ọ dị nye ndị na-adịghị aṅụ.
3Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ.
4Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ.
5Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ, ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla; ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ, nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu.
6Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha, na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ. Ha agaghị enwekwa oke nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ.
7Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị.
8Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị.
9Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
10Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga.
11Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe, ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha; ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị, ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị; kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị.
12Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru: Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya, maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ. Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ mgbe ha na-atụghị anya ya.
13Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu.
14Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya.
15Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya.
16Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe.
17Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ, karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu.
18Amamihe ka ihe agha niile mma, ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.