Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (2020)

1 Ndị Kọrint 16

Gụọ Baịbụl nʼasụsụ Igbo. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.

1Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu.
2Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara.
3Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu.
4Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro.
5Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Nʼihi na ana m ezube isi nʼụzọ Masidonia abịa.
6Mgbe m bịara, ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site, nʼinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ.
7Nʼihi na-achọghị m ileta unu ugbu a m nọ nʼije ngafere. Kama ana m ezube ịbịa nọnyere unu nwa oge, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị e kwenye.
8Ma aga m anọ nʼEfesọs tutu ruo oge Pentikọọsụ,
9nʼihi na-emegheela ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-arụpụta ezi ọrụ nye m, ma ha dị ọtụtụ bụ ndị na-eguzogide m.
10Ọ bụrụ na Timoti abịa, lezienụ anya mee ka ọ ghara inwe ihe ọ ga-atụ egwu mgbe ọ nọ nʼetiti unu, nʼihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ Onyenwe anyị dịka m si arụ ya.
11Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya.
12Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara.
13Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike.
14Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ.
15Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa. Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi.
16Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị.
17Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a.
18Ha kwalitere mmụọ m dịka ha kwalitere nke unu. Nyenụ ndị dị otu a nsọpụrụ.
19Ụlọ chọọchị niile dị nʼokpuru Eshịa na-ezitere unu ozi ekele. Akwila na Prisila, na nzukọ dị nʼụlọ ha na-enye unu ekele obiọma nʼime Onyenwe anyị.
20Ụmụnna niile nọ nʼebe a na-ekele unu. Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
21Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede ekele nke a.
22Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụghị Onyenwe anyị nʼanya, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị bịa!
23Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
24Ka ịhụnanya m dịnyere unu niile site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Amen.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020. Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ — Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission in the original work. The original work by Biblica, Inc. is available for free at biblica.com and open.bible. Source: eBible.org/ibo. License: Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International (CC BY-SA 4.0). Presentation changes: verses separated from source HTML, navigation, titles, footnotes and popups omitted, and source layout/line breaks normalized; biblical words are unchanged. This adapted Scripture presentation remains available under CC BY-SA 4.0. Original Biblica trademarks are shown for identifying the original source, not as the branding of Divine Threads; no Biblica endorsement is implied. Ọmụmụ Divine Threads nʼasụsụ Igbo na-abịa nʼoge na-adịghị anya.